Isaiah 17

Ozi e ziri banyere Damaskọs

1Nke a bụ amụma megide Damaskọs, isi obodo Siria.

“Lee, Damaskọs agaghị adịkwa! Ọ gaghị abụkwa obodo ọzọ,
kama ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke zedara ezeda.
2Ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime nʼobodo niile nke Aroea,
ọ ga-adịrị igwe atụrụ na ehi dị iche iche, ndị ga-amakpu,
ọ dịkwaghị onye ga-eme ka egwu tụọ ha nʼebe ahụ.
3Ebe e wusiri ike nke Ifrem agaghị adịkwa,
ya na ike alaeze nke sị Damaskọs,
ndị fọdụrụ nke Aram ga-adị ka
ebube nke ndị Izrel,”
otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri ya.

4“Nʼụbọchị ahụ, a ga-eme ka nsọpụrụ Jekọb nwere bụrụ ihe e wedara nʼala.
Abụba dịkwa ya nʼahụ ga-atalata.
5Ọ ga-adị ka ubi e si nʼime ya wee ihe mkpụrụ site nʼọka guzoro ọtọ,
na-achịkọta mkpụrụ nʼogwe aka ha
dịka mgbe mmadụ na-atụtụkọta mkpụrụ site nʼigbo ọka
nʼime Ndagwurugwu Refaim.
6Ma ọ bụ ole na ole nʼime mkpụrụ ahụ ga-afọdụkwa,
dịka mgbe a kuchasịrị osisi oliv,
hapụ mkpụrụ abụọ maọbụ atọ, nke dị nʼalaka kachasị elu,
maọbụ mkpụrụ anọ maọbụ ise a hapụrụ nʼọnụ ọnụ alaka nke ahụ mịrị mkpụrụ.”
Otu a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel kwubiri ya.

7Nʼụbọchị ahụ, ha ga-echeta onye kere ha,
nweekwa nsọpụrụ nʼebe Onye nsọ nke Izrel nọ.
8Nʼụbọchị ahụ, ha agaghị elekwasịkwa chi ha dị iche iche anya ka ha nyere ha aka.
Ha agakwaghị efe ihe ndị ahụ ha ji aka ha mee.
Ha agakwaghị asọpụrụ chi nwanyị ha bụ Ashera,
Ashera bụ chi nwanyị ndị Kenan. Ọ bụ osisi ka e ji egosipụta oyiyi ya na ọtụtụ ebe ịchụ aja ya. Nkp 3:7; Dit 12:3; 16:21

maọbụ ebe ịchụ aja ụda na-esi isi ụtọ nke mkpịsịaka kpụrụ.
9Nʼụbọchị ahụ, obodo ha niile e wusiri ike, nke ha hapụrụ nʼihi ndị Izrel, ga-adị ka ebe ahapụrụ ahapụ nye oke ọhịa na ahịhịa nke ọhịa. Ebe niile ga-abụ nnọọ mkpọmkpọ ebe.

10Nʼihi na ị chezọla Chineke onye na-azọpụta gị.
I chetaghị Nkume ahụ, nke bụ ebe mgbaba gị.
Ya mere, ọ masịkwa gị kụọ ihe ọkụkụ dị iche iche nke dị ụtọ,
maọbụ manye alaka osisi vaịnị ị si nʼala ọzọ bubata,
11ọ bụrụkwa na i mee ka ha too nʼụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
maọbụ na ha mara ifuru nʼụtụtụ ụbọchị ahụ ị kụnyere ha nʼala,
ị gaghị aghọta mkpụrụ ọ mịrị,
nʼihi na ọ bụ naanị ọrịa na ihe mgbu ka ha ga-ewetara gị.

12Ahaa, lee ụzụ nke ọtụtụ mmadụ na-eme,
nke yiri mkpọtụ oke osimiri.
Ọ bụ mkpọtụ nke mba dị iche iche;
ha na-eme mkpọtụ dị ka nnugharị nke ọtụtụ osimiri.
13Ọ bụ ezie na ha na-agbọ ụja dịka mkpọtụ nke oke osimiri,
ma Chineke ga-abara ha mba nke ga-eme ka ha gbaa ọsọ.
A ga-achụsa ha dịka ifufe si efesa igbugbo ọka,
na dịka mpempe akwụkwọ ifufe siri ike na-ebugharị gburugburu gburugburu.
14Nʼanyasị, ha na-eme ka oke egwu dịrị,
tutu ruo ụtụtụ, ha adịghịkwa.
Nke a bụ ihe nketa dịịrị ndị ahụ na-apụnara anyị ihe anyị nwere nʼike.
E, ọ bụ ihe nza ruru ndị ahụ ji ike na-anakọrọ anyị ihe anyị nwere.
Copyright information for IboBIU